Ebe foto si, Jimmy Odukoya/Instagram

Dịka onye ihe ejije Nollywood a ma ama tupu ọ bụrụ pastọ bụ Jimmy Odukoya gbara n'anwụ na ọ lụọla nwaanyị ọhụrụ, ụmụ afọ Nigeria kpụ ya n'ọnụ na soshal midia.

Odukoya, onye bụzi onyeisi ụlọụka 'Fountain of Life Church, Lagos', gbara ama ahụ n'Ụbọchịụka abalí mbú nke ónwa Novemba afo 2026 dịka ọ kpọrọ nwunye bụ Mo Jasmine oku ka ọ pụta n''ihu ndịụka.

" Ị ma na Akwụkwọ Nso kwuru na ọ dịghị mma..."

" A na m achọ were hụ...

" Ụmụnwoke na ụmụnwaanyị , ka m mee ka ụnụ mata nwunye m bụ'

End of content

Ngwa ngwa Ụkọchukwu Jimmy bụ nwa ụkọchukwu abụọ a ma ama lara mmuo; Tunde Odukoya na Bimbo Odukoya gbara n'anwụ na ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ, ọtụtụ ụmụ Naijiria jiri ya mere isi akụkọ dịka ha na-arụtụ aka na ọ lụbuola nwaanyị, ha gbaa arụkwaghịm.

Ụfọdụ na-akatọ ya maka ịlụ nwaanyị ọhụrụ dịka onye nke ya na ya lụburu ka dị ndụ, ebe ụfọdụ na-akwado ya sị na ọ ka mma di na nwnye na-ese okwu gbasra kama otu igbu ibe ya.

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

End of X post, 1

End of X post, 2

End of X post, 3

Jimmy lụburu Kemi Banjoko n'afọ 2013 na London, onye ya na ya mụtara ụmụ abụọ tupu ha gbasaa n'afọ.

End of Akachasị Gụọ

Nke yiri ibe ya bụ na nwanne ya tọrọ ya bụ Tolu Odukoya bụ onye ya na ya bụ ndị ndu ụka nne na nna ha hapụrụ nluburu di, Olumide Ijogun, mana ya gbasara n'afọ 2021.

Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Jimmy Odukoya

Ihe ndị ị maghi maka Mo Jasmine Daniel, nwunye ọ hụrụ Jimmy Odukoya

Ebe foto si, Mo Jasmine/Instagram

Mo Jasmine Daniel bụ nwa Ụkọchukwu Theophilus na oriakụ Bolaji Daniel

• Ọ luburu Mosadoluwa Adegboye tupu ọ lụọ Pastọ Jimmy Odukoya na nsonso a

Chọpụta karịa

Vidio

Njebe Vidio

Isi akụkọ

Enweghi ihe na-esere mụ na Peter Obi, ihe anyị na-eme bụ ndọrọndọrọ ọchịchị - Gọvanọ Soludo

Ifeanyichukwu Joseph: Ihe anyị ma maka nwokorobia a sị si n'ụlọelu tụtuo nwanne enyi ya nwaanyị n'Imo state

Nnyocha e mere n'ahụ mmadụ abụọ a na-enyo bu ọrịa Ebola na Nigeria gosiri na ha ebughi ọrịa a -NCDC

Kọwaara m isi akụkọ

Akụkọ akachasị gụọ